 |
IGBO MAKA JUNIO SEKONDIRI - BOOK 1
Author: Ndeghari na Mbiputa Ohuru, E Nolue Emenanjo, Basil U Ekwe, Okolie O Okolie, Ngozi Kanu,
Nwata na-eto, nti ya ana-asa. Etu ahụ ka ọ dikwa maka agụmakwụkwọ. N\\\'afọ 2006, Gọọmenti Etiti wepụtara kurikulum ọhụrụ maka nkuzi, ọgụgụ na ọmụmụ Igbo na juniọ sekọndịrị. N\\\'ihi ya, anyị gara n\\\'ihu degharichaa ma hazichakwaa akwụkwọ ndị ochie ahụ anyị dere a na-akpọ: Igbo Maka Junịọ Sekọndịrị 1-3. Iji mee ka akwụkwọ ndị ọhụrụ anyị a, a ka na-akpọkwa; Igbo Maka Junịọ Sekọndịrị 1-3, tozuo òkè ma bụrụkwa akwaa akwụrụ, anyị sara anya na miri gbakwasị ụkwụ na nchịkọta mbunuuche kurikulum ọhụrụ ahụ, tinyekwuo isiokwu, ndịniisiokwu, ihe ụmụ akwụkwọ ga-eme, nka nkuzi, na nnwale.
|