Catalog : Junior Secondary
IGBO MAKA JUNIO SEKONDIRI - BOOK 3Author: Ndeghari na Mbiputa Ohuru, E Nolue Emenanjo, Basil U Ekwe, Okolie O Okolie, Ngozi Kanu,ISBN: 978 978 069 203 2 Nwata na-eto, nti ya ana-asa. Etu ahụ ka ọ dikwa maka agụmakwụkwọ. N\\\'afọ 2006, Gọọmenti Etiti wepụtara kurikulum ọhụrụ maka nkuzi, ọgụgụ na ọmụmụ Igbo na juniọ sekọndịrị. N\\\'ihi ya, anyị gara n\\\'ihu degharichaa ma hazichakwaa akwụkwọ ndị ochie ahụ anyị dere a na-akpọ: Igbo Maka Junịọ Sekọndịrị 1-3. Iji mee ka akwụkwọ ndị ọhụrụ anyị a, a ka na-akpọkwa; Igbo Maka Junịọ Sekọndịrị 1-3, tozuo òkè ma bụrụkwa akwaa akwụrụ, anyị sara anya na miri gbakwasị ụkwụ na nchịkọta mbunuuche kurikulum ọhụrụ ahụ, tinyekwuo isiokwu, ndịniisiokwu, ihe ụmụ akwụkwọ ga-eme, nka nkuzi, na nnwale. Nwata na-eto, nti ya ana-asa. Etu ahụ ka ọ dikwa maka agụmakwụkwọ. N\\\'afọ 2006, Gọọmenti Etiti wepụtara kurikulum ọhụrụ maka nkuzi, ọgụgụ na ọmụmụ Igbo na juniọ sekọndịrị. N\\\'ihi ya, anyị gara n\\\'ihu degharichaa ma hazichakwaa akwụkwọ ndị ochie ahụ anyị dere a na-akpọ: Igbo Maka Junịọ Sekọndịrị 1-3. Iji mee ka akwụkwọ ndị ọhụrụ anyị a, a ka na-akpọkwa; Igbo Maka Junịọ Sekọndịrị 1-3, tozuo òkè ma bụrụkwa akwaa akwụrụ, anyị sara anya na miri gbakwasị ụkwụ na nchịkọta mbunuuche kurikulum ọhụrụ ahụ, tinyekwuo isiokwu, ndịniisiokwu, ihe ụmụ akwụkwọ ga-eme, nka nkuzi, na nnwale. Anyị gakwara n\\\'ihu lebazie anya na silọbọọsu ndi ahụ e jizi akụzi Igbo na junịọ sekọndịrị na steeti niile ndị ahụ a na-asụ Igbo, ma na-akụzi ya dịka asụsụ ndị amaala. N\\\'ihe niile e dere, e bu ụmụ akwụkwọ n\\\'obi. Iji mekwa ka ụmụ akwụkwọ nwetakwuo ma nwetazuo uru ndị dị n\\\'akwụkwọ ndị a, akwụkwọ ọ bụla, nwere akwụkwọ arụmarụ nke aka ya. N\\\'ezie, nwata akwụkwọ ọ bụla onye nkuzi ọ bụla, na ụlọ akwụkwọ ọ bula chọọrọ imata ihe ekwe na-akụ maka asụsụ Igbo, ụtọasụsụ Igbo, agụmagụ ọdịnaala na agụmagụ ugbu a, omenaala na ewumewu Igbo, tinyekwuo odide na ọgụgụ Igbo na junịọ sekọndịrị, n\\\'agba ọhụrụ dị ka kurikulum ọhụrụ siri chọọ ya, ya gaa n\\\' Igbo Maka Junịọ Sekọndịrị 1-3. Ndị na-akwado maka ‘Junịọ WAEC\\\', gaanụ n\\\'Akwụkwọ nke afo atọ na Akwụkwọ Arụmarụ nke Atọ. Unu hụ ebe ọ bụla akwụkwọ ndị a rìri mperi, zigachiri anyị akwụkwọ ndị a, anyị ga-enyeghachi unu ego unu! Igbo bụ Igbo, ahịa ọma na-ere onwe ya. |





Write a Comment: